Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 11 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Maachị 2027

Tọọzdee · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 4 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 32:7–14

7Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha. 8Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi. 10Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.” 11Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt? 12Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ. 13Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 14Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 106:19–23

19Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa. 20Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha. 21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt, 22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie. 23Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.

Oziọma

Jọn 5:31–47

31“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu. 32Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu. 33“Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ. 34Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu. 35Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta. 36“Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m. 37Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya. 38Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere. 39Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. 40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ. 41“Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ. 42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu. 43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya. 44Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke? 45“Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya. 46Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m. 47Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike