Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 12 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 27 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Maachị 2027

Fraịdee · Izu chiiz · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke Izu chiiz

Izu chiiz

Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Zek 8:7–17

7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ. 8Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.” 9Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 10Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya. 11Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 12“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa. 13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.” 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, 15“otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ. 16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. 17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Zek 8:19–23

19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.” 20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa. 21Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’ 22Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.” 23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 12 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike