Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 5 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Maachị 2027
Fraịdee · Izu nke 3 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 3 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Obubu ọnụ na nchegharị
Izere anụ
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. 5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; 6ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Abụ Ọma nzaghachi
5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: 6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. 7Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela 8“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel! 9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. 10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. 13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. 16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
Oziọma
28Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?” 29Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 30Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ 31Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” 32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. 33Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” 34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike