Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 6 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Maachị 2027
Satọdee · Izu nke 3 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 3 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị. 2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya. 3Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.” 4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta. 5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè. 6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. 18Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem. 19Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.
Oziọma
9Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya. 10“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ. 11Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a. 12Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ 13“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’ 14“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike