Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 4 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Maachị 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 3 nke Lent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Onye nsọ Kasimir · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jer 7:23–28

23Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma. 24Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ. 25Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m. 26Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’ 27“Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza. 28Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 95:1–2, 6–9

1Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 8“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.

Oziọma

Luk 11:14–23

14Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya. 15Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike