Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 5 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 20 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Maachị 2027

Fraịdee · Izu ịhapụ anụ · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke Izu ịhapụ anụ

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Jọn 1:1–13

1Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye Chineke họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ. 2Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: 3Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya. 4Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu. 5Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya. 6Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya. 7Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst. 8Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju. 9Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya. 10Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya. 11Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya. 12Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke. 13Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.

Oziọma

Mak 15:22, 25, 33–41

22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie. 34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 35Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!” 36Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.” 37Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume. 38Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya. 39Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” 40O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi. 41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 5 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike