IGCB · Isi 14 / 14
Hosiya 14
1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
6ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.
7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org