Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 16 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 3 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Febrụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Meeting of the Lord

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka Mọnde)

1Pt 2:21–3:9

21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. 22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.” 23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu. 25Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya. 3:1Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, 2mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. 3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. 4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. 5Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha. 6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu. 7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu. 8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala. 9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.

Akwụkwọ ozi

1Pt 3:10–22

10Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ. 11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya. 12Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.” 13Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe? 14Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.” 15Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a. 16Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu. 17Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe. 18Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya. 19Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ. 20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ. 21Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst, 22onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Simiọn na Onye nsọ Ana)

Hib 9:11–14

11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, 12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. 13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. 14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.

Oziọma (maka Mọnde)

Mak 12:13–17

13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya. 14Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi? 15Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.” 16Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.” 17Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.

Oziọma

Mak 12:18–27

18Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị, 19“Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ. 20Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla. 21Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. 22Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. 23Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?” 24Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke? 25Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 26Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. 27Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”

Oziọma (maka Onye nsọ Simiọn na Onye nsọ Ana)

Luk 2:25–38

25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” 33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.” 36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 16 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike