Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 15 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 2 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Febrụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

On this day we observe the Meeting of our Lord, God, and Saviour Jesus Christ

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 12; Ọpụ 13; Ọnụ 8; Lev 12 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 6:1–12

1Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. 2Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. 3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.” 4Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ. 5Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!” 6Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja. 7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.” 8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.” 9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’ 10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.” 11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile. 12Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya, ala niile atọgbọkwara nʼefu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 19:1, 3–5, 12, 16, 19–21

1Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha. 3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa. 4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.” 5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa. 12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt. 16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Luk 2:25–32

25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.”

Akwụkwọ ozi (maka Nzute Onyenwe anyị)

Hib 7:7–17

7O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta. 8Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ. 9Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham. 10Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya. 11Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn? 12Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu. 13Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja. 14Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja. 15E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. 16Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. 17Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.”

Oziọma (maka Nzute Onyenwe anyị)

Luk 2:22–40

22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”), 24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.” 25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” 33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.” 36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem. 39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili. 40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 15 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike