Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 16 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Febrụwarị 2027
Tiuzdee · Izu nke 1 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 1 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
Abụ Ọma nzaghachi
3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; 16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Oziọma
7Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. 8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu. 9“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. 10Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe. 11Nye anyị nri nke ụbọchị taa. 12Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. 13Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’ 14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu. 15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike