Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 17 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 4 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Febrụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Meeting of the Lord

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Pt 4:1–11

1Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. 2Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. 3Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. 4Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu. 5Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. 6Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ. 7Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere. 8Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. 9Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla. 10Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi. 11Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma

Mak 12:28–37

28Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?” 29Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 30Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ 31Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” 32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. 33Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” 34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ. 35Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid? 36Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ 37Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 17 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike