Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 18 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 5 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Ụbọchị tupu Teofani

Obubu ọnụ otu ụbọchị · Obubu ọnụ siri ike

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 1: Amụma

Aịz 35:1–10

1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ; okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara. Dịka rozu, 2ọ ga-agbawa ifuru jupụta; ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ. A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn, nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel. Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ, ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị. 3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume. 4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

Elekere nke 1: Akwụkwọ ozi

Ọrụ 13:25–32

25Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’ 26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. 27Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. 28Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. 29Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. 30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.

Elekere nke 1: Oziọma

Mat 3:1–11

1Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, 2“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 3Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 5Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. 6Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 7Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. 9Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 10Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ. 11“Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.

Elekere nke 3: Amụma

Aịz 1:16–20

16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Elekere nke 3: Akwụkwọ ozi

Ọrụ 19:1–8

1Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ, 2sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.” 3Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.” 4Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.” 5Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 6Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma. 7Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ. 8Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.

Elekere nke 3: Oziọma

Mak 1:1–8

1Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. 2Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.” 3“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 7O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”

Elekere nke 6: Amụma

Aịz 12:3–6

3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Elekere nke 6: Akwụkwọ ozi

Rom 6:3–11

3Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. 4Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. 5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. 6Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. 7Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. 8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. 9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. 10Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. 11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Elekere nke 6: Oziọma

Mak 1:9–15

9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” 12Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara. 13Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi. 14Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”

Elekere nke 9: Amụma

Aịz 49:8–15

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “ Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.

Elekere nke 9: Akwụkwọ ozi

Taị 2:11–14; 3:4–7

11Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè. 12Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. 13Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst. 14Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile. 3:4Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe, 5ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ, 6onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst, 7ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi.

Elekere nke 9: Oziọma

Mat 3:13–17

13Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim. 14Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?” 15Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere. 16Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. 17Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 1:1–13

1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 14:15–18, 21–23, 27–29

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu. 16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee. 17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya. 18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. 22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 23Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. 27Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. 28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 15:22–16:1

22Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ 23Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) 24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” 25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha. 26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.” 27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ. 16:1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jos 3:7–8, 15–17

7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. 8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ” 15Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, 16mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. 17Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

2Ez 2:6–14

6Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje. 7Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan. 8Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 9Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.” 10Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.” 11Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe. 12Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ. 13Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan. 14O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

2Ez 5:9–14

9Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya. 10Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.” 11Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m. 12Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ. 13Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ” 14Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 1:16–20

16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 32:1–10

1Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ. 2Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim. 3Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm. 4O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a. 5Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ” 6Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.” 7Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya. 8O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.” 9Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’ 10Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 2:5–10

5Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. 6Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.” 7Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” 8Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. 9Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. 10Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Nkp 6:36–40

36Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa, 37lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.” 38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi. 39Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.” 40Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Ez 18:30–39

30Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ. 31Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo Jekọb, onye okwu Onyenwe anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ Izrel.” 32O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu. 33Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị, 34“Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a. 35Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu. 36Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile. 37Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.” 38Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ. 39Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “ Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

2Ez 2:19–22

19Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.” 20Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya. 21Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ ” 22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 49:8–15

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “ Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.

Akwụkwọ ozi (maka ụbọchị tupu Teofani)

1Kọ 9:19–27

19Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst. 20Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru. 21Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru. 22Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ. 23Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya. 24Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ. 25Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. 26Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. 27Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.

Oziọma (maka ụbọchị tupu Teofani)

Luk 3:1–18

1Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin, 2mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. 3Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 4Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. 5A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. 6Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ” 7Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 9Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.” 10Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?” 11Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.” 12Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?” 13Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.” 14Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.” 15Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. 16Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. 17Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 35:1–10

1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ; okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara. Dịka rozu, 2ọ ga-agbawa ifuru jupụta; ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ. A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn, nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel. Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ, ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị. 3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume. 4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 55:1–13

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. 12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ. 13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”

Ngọzi Ukwu nke Mmiri

Aịz 12:3–6

3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Ngọzi Ukwu nke Mmiri (Akwụkwọ ozi)

1Kọ 10:1–4

1Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee. 2Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis. 3Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ. 4Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

Ngọzi Ukwu nke Mmiri (Oziọma)

Mak 1:9–11

9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 18 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike