Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 17 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 4 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Jenụwarị 2027
Sọnde · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde tupu Teofani
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 11
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde tupu Teofani)
5Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị. 6Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala. 7Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ. 8Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.
Oziọma (maka Sọnde tupu Teofani)
1Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. 2Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.” 3“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 7O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 17 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike