Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 18 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 5:1–10

1A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche. 2Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume. 3Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ. 4O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn. 5Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.” 6Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” 7Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara. 9Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. 10Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 110:1–4

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” 2Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”

Oziọma

Mak 2:18–22

18Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?” 19Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ. 20Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. 21“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa. 22Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike