Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 3 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 21 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Jenụwarị 2027
Sọnde · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 31 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde tupu Ọmụmụ Kraịst
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. 15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha. 17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa. 20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.” 9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 15Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche. 16Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. 17Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. 15Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 9
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde tupu Ọmụmụ Kraịst)
9Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ. 10Nʼihi na ọ na-ele anya ala ahụ nke nwere ntọala, nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke. 17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja, 18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya. 20Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu. 21Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya. 22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya. 23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. 32Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma, 33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. 34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. 35Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. 36E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. 37A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. 38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. 39A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. 40Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.
Oziọma (maka Sọnde tupu Ọmụmụ Kraịst)
1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham. 2Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya. 3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. 4Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. 5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi. 6Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya. 7Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa. 8Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa. 9Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. 10Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. 11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. 12Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel. 13Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa. 14Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud. 15Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. 16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ. 18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Disemba na kalenda nzukọ bụ 3 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike