Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 4 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 22 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Forefeast of the Nativity

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jem 2:14–26

14Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? 15Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, 16ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? 17Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya. 18Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ 19I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja. 20Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya? 21Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja? 22Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. 23Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke. 24Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe. 25Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche? 26Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.

Oziọma

Mak 9:42–10:1

42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. 43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; 44ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; 46ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 47Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, 48ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 49A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu. 50“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.” 10:1Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Disemba na kalenda nzukọ bụ 4 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike