Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 2 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 20 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Jenụwarị 2027

Satọdee · Izu nke 31 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee tupu Ọmụmụ Kraịst

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 1:3–6

3Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele. 4Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya. 5Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma, 6nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.

Akwụkwọ ozi (maka Satọdee tupu Ọmụmụ Kraịst)

Gal 3:8–12

8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. 10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”

Oziọma

Luk 14:1–11

1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 2Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. 3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” 4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa. 5Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?” 6Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a. 7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị, 8“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ. 9Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala. 10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. 11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

Oziọma (maka Satọdee tupu Ọmụmụ Kraịst)

Luk 13:18–29

18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” 22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Disemba na kalenda nzukọ bụ 2 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike