Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 3 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Jenụwarị 2027

Sọnde · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke abụọ mgbe Krismas gasịrị

Sọnde · Agba ofufe: ọcha

Aha Kachasị Nsọ nke Jisọs · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 147:12–15, 19–20

12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị. 13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa. 19O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel. 20O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Efe 1:3–6, 15–18

3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. 4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. 5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. 6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya. 15Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ, 16esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile. 17Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ, 18ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ.

Oziọma

Jọn 1:1–18

1Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. 2Ya na Chineke nọ site na mbụ. 3E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. 4Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, 5ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya. 6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. 7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. 8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ. 9Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa. 10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ. 11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. 12Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. 13Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke. 14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu. 15Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ” 16Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara. 17Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst. 18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike