Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 27 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Disemba 2026
Sọnde · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
Ezinaụlọ Nsọ nke Jisọs, Meri na Josef
Mmemme · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.” 2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” 3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” 4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” 6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. 21:1Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa. 2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. 3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
Abụ Ọma nzaghachi
1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
8Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga. 11Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi. 12Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri. 17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja, 18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya.
Oziọma
22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”), 24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.” 25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” 33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.” 36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem. 39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili. 40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn, Onyeozi na Onye dere Oziọma
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike