Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 26 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Disemba 2026

Satọdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Stivin, Onye mbụ nwụrụ nʼihi okwukwe

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 6:8–10; 7:54–60

8Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. 9Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. 10Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. 7:54Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. 55Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. 56Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.” 57Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, 58dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl. 59Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” 60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 31:2–3, 5, 7, 15–16

2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 15Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. 16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.

Oziọma

Mat 10:17–22

17Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha. 18A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ. 19Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. 20Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 21“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 22Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike