Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 27 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 14 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Disemba 2026
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde nke Ndị nna nna
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 8
11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
Akwụkwọ ozi (maka ndị nna nna)
4Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya. 5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị). 6Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi. 7Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha. 8Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta. 9Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. 10Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya. 11Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.
Oziọma (maka ndị nna nna)
16Ma ọ sịrị ya, “Otu onye na-akwado oke oriri kpọkwa ọtụtụ mmadụ oku. 17Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ohu ya ka ọ ga gwa ndị ahụ ọ kpọrọ sị, ‘Bịanụ, nʼihi na e dozichaala ihe niile.’ 18“Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 19“Onye nke ọzọ sịrị, ‘Azụrụ m ehi e ji arụ ọrụ ubi, iri e jikọrọ abụọ abụọ. Ana m aga ugbu a ka m nwalee ha, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 20“Ma onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwunye ọhụrụ, nʼihi nke a agaghị m abịa.’ 21“Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’ 22“Ohu ahụ sịrị, ‘Nna m ukwu, emeela m ihe i kwuru, ma ohere ka fọdụrụ.’ 23“Nna ukwu ahụ sịrị ohu ahụ, ‘Gaakwa nʼokporoụzọ ukwu na okporoụzọ nta, mee ka ndị mmadụ bata nʼụlọ m, ka ụlọ m jupụta na mmadụ. 24Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Disemba na kalenda nzukọ bụ 27 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike