57Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs,
58jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ.
59Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya,
60ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
61Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.