Bible Explorer

Baịbụl › Job › 11

IGCB · Isi 11 / 42

Job 11

1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?

3Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?

4Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’

5Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.

6Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

7“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?

8Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?

9Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.

10“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?

11Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?

12Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.

13“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,

14ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị

15mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.

16Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.

17Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.

18Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.

19Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.

20Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org