Bible Explorer

Baịbụl › Job › 15

IGCB · Isi 15 / 42

Job 15

1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:

2“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?

3Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?

4Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.

5Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.

6Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.

7“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?

8Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?

9Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?

10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.

11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?

12Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,

13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?

14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?

15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,

16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.

17“Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,

18bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,

19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.

20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.

21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.

22O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.

23Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.

24Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.

25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.

26O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.

27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,

28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.

29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.

30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.

31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.

32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ

33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.

35Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org