Bible Explorer

Baịbụl › Job › 12

IGCB · Isi 12 / 42

Job 12

1Mgbe ahụ, Job zara:

2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.

3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!

5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.

6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.

8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.

9Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?

10Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ

11Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?

12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?

13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.

14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.

15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.

16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.

18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.

19Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.

20Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.

21Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.

22Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.

23Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.

24Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.

25Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org