IGCB · Isi 33 / 42
Job 33
1“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.
2Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.
3Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.
4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.
5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
8“Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
9‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.
10Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.
11Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’
12“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.
13Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?
14Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.
15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.
16O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,
18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.
20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.
22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,
24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’
26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
30Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
31“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu.
32Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.
33Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org