Bible Explorer

Baịbụl › Job › 17

IGCB · Isi 17 / 42

Job 17

1Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.

2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.

3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?

4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.

5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.

6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.

7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.

8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.

9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.

10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.

11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m

12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.

13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,

14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’

15ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?

16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (IGCB, 2020) · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. (a gbanweghị ederede; a hapụrụ ihe ndetu nʼala na isiokwu) · eBible.org