Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Ịka nká
Ndụ na ọrụ
Ihe Baịbụl kwuru banyere Ịka nká
Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (10), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.
Ilu 16:31
Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.Aịz 46:4
Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.Ilu 20:29
Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.Lev 19:32
“ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.2Kọ 4:16
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.Job 12:12
Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?Abụ 71:18
O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.Abụ 71:9
Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.Abụ 92:14
Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,Ilu 17:6
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.
Isi mmalite
Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.