Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 21 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 8 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Novemba 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
13Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?” 14Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” 15Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
2Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche. 7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha, 11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. 12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.” 13Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” 14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” 15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.” 16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.” 17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu. 18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.” 19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ. 20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a. 21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya. 22Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!” 23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.” 24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
7Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ. 8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.” 9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. 10Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” 11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. 13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha. 19Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ. 20A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 11
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Akwụkwọ ozi
11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo. 12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst. 13Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ. 14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ. 15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa. 16Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke. 17Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m. 18Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Akwụkwọ ozi (maka ndị mmụọ ozi)
2Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya. 3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya. 4Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị. 5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa. 6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? 7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, 8dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya. 9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. 10Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
Oziọma
41Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya. 42Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya. 43Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. 44O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara. 45Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.” 46Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.” 47Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. 48Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.” 49Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.” 50Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.” 51Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. 52Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.” 53Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ. 54Ma o jidere ya nʼaka, sị, “Nwa m, bilie!” 55Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. 56Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.
Oziọma (maka ndị mmụọ ozi)
16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Novemba na kalenda nzukọ bụ 21 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike