Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 22 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 9 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Novemba 2027

Mọnde · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Onisiphorus and Porphyrius of Ephesus (3rd-4th C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 1:1–5

1Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu. 2Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. 3Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu. 5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.

Oziọma

Luk 12:13–15, 22–31

13Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” 14Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” 15Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” 22Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi. 23Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe. 24Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a. 25Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya? 26Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ? 27“Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a. 28Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta. 29Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu. 30Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa. 31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Novemba na kalenda nzukọ bụ 22 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike