Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 21 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Novemba 2027

Sọnde · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Eze nke Eluigwe na Ụwa

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dan 7:13–14

13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 93:1–2, 5

1Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 5Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Mkp 1:5–8

5sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. 6O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 7“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen. 8Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”

Oziọma

Jọn 18:33–37

33Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” 34Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” 36Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” 37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike