Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 15 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Novemba 2027
Mọnde · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Albert Onye Ukwu, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
Abụ 119:53, 61, 134, 150, 155, 158
53Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ. 61A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị. 134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. 150Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. 155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. 158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
Oziọma
35O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. 36Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme. 37Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.” 38O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!” 39Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 40Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya, 41“Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.” 42Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.” 43Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Albert Onye Ukwu, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike