Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 16 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Novemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Gertrude Onye Ukwu, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Onye nsọ Magaret nke Skọtland · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. 2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela 3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. 4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela 5Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche. 6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla. 7Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
Oziọma
1Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ. 5Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” 6Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya. 7Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.” 8Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” 9Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Gertrude Onye Ukwu, Nwaagbọghọ
- Onye nsọ Magaret nke Skọtland
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike