Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 15 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 2 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Novemba 2027
Mọnde · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Acyndinos, Pegasias, Aphthonios, Elpidiphoros, Anempodistus and 7,000 suffering with them in Persia (c.341-345)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile, 14kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe. 15Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe. 16Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike. 17Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst. 18Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu. 19Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too. 20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?
Oziọma
29Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona. 30Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a. 31Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a. 32Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.” 33“Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Novemba na kalenda nzukọ bụ 15 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike