Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 14 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Novemba 2027

Sọnde · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 33 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dan 12:1–3

1“Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta. 2Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi. 3Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 16:5, 8–11

5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 10:11–14, 18

11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. 12Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. 13Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 14Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. 18Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.

Oziọma

Mak 13:24–32

24“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; 25kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’ 26“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe. 28“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. 29Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. 30Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide. 32“Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike