Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 31 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 18 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Ọktoba 2027

Sọnde · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Jọn 1:1–7

1Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. 2Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. 3Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ. 4Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke. 5Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. 6Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. 7Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jem 1:1–12

1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ! 2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. 3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. 4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu. 5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. 6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya. 7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla. 8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme. 9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. 10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. 11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya. 12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jud 1:1–7, 17–25

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 17Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu. 18Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. 19Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.” 20Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. 21Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. 22Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. 23Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị. 24Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ 25ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 8

Jọn 20:11–18

11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.

Akwụkwọ ozi

2Kọ 11:31–12:9

31Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. 32Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m. 33Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya. 12:1Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m. 2Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. 3Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Luk)

Kọl 4:5–9, 14, 18

5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. 6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. 7Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m. 8Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume. 9Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a. 14Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu. 18Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.

Oziọma

Luk 8:5–15

5“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo. 6Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ. 7Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha. 8Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” 9Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara. 10Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’ 11“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke. 12Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. 13Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ. 14Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ. 15Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Oziọma (maka Onye nsọ Luk)

Luk 10:16–21

16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 31 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike