Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 31 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Ọktoba 2027
Sọnde · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 31 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
2Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo. 3Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa. 4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. 50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
23Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. 24Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. 25Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha. 26Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
28Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?” 29Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 30Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ 31Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” 32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. 33Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” 34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike