Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 30 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 17 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Ọktoba 2027
Satọdee · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Holy Prophet Hosea († 820 BC)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
58Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu. 16:1Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu. 2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
Oziọma
1Nʼotu ụbọchị izuike, mgbe Jisọs na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụfọdụ nʼime ogbe ọka ndị ahụ, na-amazu ha nʼaka, ma na-ata ha. 2Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike?” 3Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya? 4Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.” 5Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.” 6Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 7Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. 8Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ. 9Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” 10Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 30 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike