Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 24 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 11 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Ọktoba 2027
Sọnde · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Ndị nna nke Kansụl Ụwa nke asaa
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. 15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha. 17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa. 20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.” 9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 15Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche. 16Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. 17Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. 15Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7
1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Akwụkwọ ozi
6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. 7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. 8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. 9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” 10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. 11Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
Akwụkwọ ozi (maka ndị nna)
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya. 10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya. 11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu. 12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. 13Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. 14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. 15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Oziọma
11O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa. 12Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya. 13Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.” 14Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!” 15Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya. 16Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”
Oziọma (maka ndị nna)
1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa. 6“Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru. 13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 24 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike