Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 24 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Ọktoba 2027

Sọnde · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 30 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jer 31:7–9

7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘ Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 126:1–6

1Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “ Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 5:1–6

1A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche. 2Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume. 3Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ. 4O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn. 5Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.” 6Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”

Oziọma

Mak 10:46–52

46Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. 47Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” 48Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 49Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” 50Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. 51Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” 52Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike