Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 23 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 10 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Eulampius and Eulampia, at Nicomedia, and 200 martyrs with them († 303-311)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 15:39–45

39Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha. 40Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche. 41Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube. 42Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. 43A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike. 44A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ. 45E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.”

Oziọma

Luk 5:27–32

27Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.” 28Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya. 29Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?” 31Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. 32Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 23 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike