Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 25 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 12 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Ọktoba 2027
Mọnde · Izu nke 19 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Probos, Tarachos and Andronicus, at Tarsus in Cilicia († 304)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. 4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. 5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. 6Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. 7Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.
Oziọma
36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. 37Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ. 38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha. 39Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.” 40Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.” 41“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. 42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?” 43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.” 44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. 45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ. 46Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ. 47Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.” 48Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.” 49Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?” 50Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 25 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike