Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 4 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Ọktoba 2027
Mọnde · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Fransis nke Assisi · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị, 2“Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.” 3Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu Onyenwe anyị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu Onyenwe anyị. 4Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ. 5Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra. 6Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.” 7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona. 8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?” 9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.” 10Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị. 11Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?” 12Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.” 13Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ. 14Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “ Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.” 15Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara. 16Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche. 17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị. 2:10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
Abụ Ọma nzaghachi
2Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. 3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
Oziọma
25Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?” 26Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?” 27Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” 28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.” 29Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?” 30Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. 31Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. 32Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. 33Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. 34Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. 35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’ 36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?” 37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Fransis nke Assisi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike