Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 4 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 21 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Ọktoba 2027
Mọnde · Izu nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Apodosis of the Exaltation of the Cross
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya. 5:1Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ. 2Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla. 3Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ. 4E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya. 5Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị. 6Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya. 7Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ? 8Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa. 9Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo. 10Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
Oziọma
19Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere, 20tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 21Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. 22Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Septemba na kalenda nzukọ bụ 4 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike