Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 5 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Faustina Kowalska, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jona 3:1–10

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị, 2“Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.” 3Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu. 4Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.” 5Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe. 6Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ. 7Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri. 8Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa. 9Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.” 10Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 130:1–4, 7–8

1Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.

Oziọma

Luk 10:38–42

38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike