Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 3 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Ọktoba 2027

Sọnde · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 27 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 2:18–24

18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.” 19Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya. 20Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya. 21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 128:1–6

1Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, 6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 2:9–11

9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. 10Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ. 11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.

Oziọma

Mak 10:2–16

2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. 6Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ 7‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. 11Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. 12Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.” 13Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. 14Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. 15Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.” 16Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike