Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 3 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 20 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Ọktoba 2027

Sọnde · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 4

Luk 24:1–12

1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.

Akwụkwọ ozi (maka Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)

Gal 2:16–20

16ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu. 17Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba! 18Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu. 19Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe. 20Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

Akwụkwọ ozi

2Kọ 4:6–15

6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. 12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu. 13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.

Oziọma (maka Sọnde mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)

Mak 8:34–9:1

34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. 35Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya. 36Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha? 37Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya? 38Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.” 9:1Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”

Oziọma

Mat 22:35–46

35Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?” 37Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.” 41Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha, 42“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.” 43Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị, 44“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ 45Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?” 46Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Septemba na kalenda nzukọ bụ 3 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike