Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 2 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 19 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Ọktoba 2027
Satọdee · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka Satọdee mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)
26Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. 27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. 28Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. 29Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.
Akwụkwọ ozi
17Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile. 18Ụfọdụ nʼime unu amalitela ịfụlị onwe ha elu, chee na mụ enweghị ike ịbịakwute unu ọzọ. 19Ma site nʼike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nʼoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu. 20Nʼihi na alaeze Chineke abụghị ihe okwu ọnụ kama ọ bụ ngosipụta ịdị ike. 21Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa? 5:1Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri. 2Ma unu na-akpa nganga? Ihe unu kwesiri ime ọ bụghị ịkwa akwa na iru ụjụ, na ime ka onye mere ihe dị otu a si nʼọgbakọ unu pụọ? 3Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nʼime mmụọ. Amaala m rịị onye ahụ ikpe dịka a ga-asị na mụ na unu nọ. 4Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs, 5werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri.
Oziọma (maka Satọdee mgbe Mbuli elu nke Obe gasịrị)
21Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.” 22Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?” 23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. 24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.” 25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. 26E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.” 27Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. 28Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. 29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” 30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
Oziọma
1Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 2Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.” 3Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” 4Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. 5Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 6Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. 7Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. 8Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa. 9“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 10Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. 11Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. 12Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. 13Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Septemba na kalenda nzukọ bụ 2 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike