Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 29 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 16 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Septemba 2027

Wenezdee · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Exaltation of the Cross

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Gal 3:15–22

15Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. 16Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst. 17Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. 18Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya. 19Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire. 20Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu. 21Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu. 22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Eufemia)

2Kọ 6:1–10

1Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu. 2Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta. 3Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta. 4Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị. 5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị. 10Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.

Oziọma

Mak 6:7–13

7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. 8Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu. 9Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe. 10Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 11Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 12Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa. 13Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.

Oziọma (maka Onye nsọ Eufemia)

Luk 7:36–50

36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. 37Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ. 38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha. 39Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.” 40Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.” 41“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. 42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?” 43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.” 44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. 45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ. 46Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ. 47Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.” 48Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.” 49Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?” 50Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Septemba na kalenda nzukọ bụ 29 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike