Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 29 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Septemba 2027
Wenezdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ndị nsọ Maikel, Gebrel na Rafael, Ndịisi ndị mmụọ ozi
Mmemme · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: Mkp 12:7–12
9“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. 13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile. 3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. 5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.
Oziọma
47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Maikel, Gebrel na Rafael, Ndịisi ndị mmụọ ozi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike